Home / iReport / Okwu Ochi 1: Mgbechikwelụ

Okwu Ochi 1: Mgbechikwelụ

ezigbo-nwaafo-igbo-people-nigeria-biafra-amaka-mgbechikwelu-nwokeSoro M Chịa

Mgbechikwelụ ejikerela ilele ule maka taam anọ n’ime ya. Ya na ụmụakwụkwọ ibe ya echebirila onye nkuzi ga-elekọta ha ma ebido ule ahụ. Onye nkuzi abatala na kịlaasị, bido kewe akwụkwọ ha ga-eji ele ya bụ ule. Ka onye nkuzi sịrị ha bido debe ule ha, Mgbechikwelụ tụgharịrị akwụkwọ nke ya hụzie ajụjụ ajụrụ. Nke a bụ otu n’ime ajụjụ ajụrụ ya na ya bụ ule. Ngwa, lezienụ ka o sịrị zaa ajụjụ nke ya:

ULE TAAM NKE ABỤỌ
Zaa ajụjụ ndị a.

Tụgharịa ahịrịokwu Bekee ndị a n’Igbo:

I saw a MULTITUDE
Afụrụm ndị mmụọ na-eti udu

And I ASKED them
M wee were anyaike tigbuo fa

But now they have GONE
Mana ugbu a, ha alala n’egbe

Only Thomas KNOWS
Naanị imi Tọmọs na-anyịgbu ya

Mary’s sister BORN a child,
Nwanne Mèrí were ọkụ lee nwa ya,

And her mother came to SEE her.
Nne ya bịa ka o sie ya.

Do not sell fish on PENTICOST day!
Unu elekwana azụ mgbe penti na-agala ọnụ!

When Jesus was going to Galilee
Mgbe Jesu na-aga n’ili,

He SAW his APOSTLES
Ọ wee kwọọ ndị na-ejidere ya pọọsụ

And he asked them
Ọ wee jụọ ha sị

“Where have you BEEN”
“Ebee ka unu kụrụ akịdị”

“We have BEEN to Jericho”
“Anyị kụrụ akịdị na Jeriko”

Jesus TOLD them …
Jesus wee mee ha awọ …

Peace, peace unto the world.
Mamịrị mamịrị n’enu ụwa.
________________________________________________

Ọ dị unu ka Mgbechikwelụ emere ọfụma n’ule a??

Ụtụtụ ọma nụ.

Edemede a si n’aka Nwadịọramma

Comments

comments

About ndiigbokwenu1

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *