Home / Ụwa / Ala Igbo / Ọkwa dị oke mkpa

Ọkwa dị oke mkpa

ogene-Igbo-Announcement-okuekwe-Ọkwa-dị-oke-mkpaNdịbeanyị, anyị n’ekele unu oo!

Biko anyị chọrọ ndị ga enyere anyị aka melite ohere-a ka ọ dị nma karịa otu ọ dị ugbua ma tọọ ụtọ. Site taa ruo na njedebe ọnwa Februari 2017, anyị ga na-anabata ndị chọrọ inyere anyị aka kwalite asụsụ na omenala igbo. Ọbụrụ na ihe anyị n’eme ebe-a masịrị gị, na ọbụrụ na ị chọrọ inyere anyị aka n’ihe anyị n’eme ebe-a ikwalite asụsụ na omenala ndị igbo biko mee ka anyị mara site n’izite anyị ozi ebe-a ma ọbụ na ‘ịnbox’ anyị.

Ọbụrụ na Ị bụ:


– Onye nwere amamihe na ebumnuche ga-abaara ụmụigbo uru. Ọbụrụ na onwere ebumnuche na atụmatụ ọ ga-abụ anyị mee n’ohere-a ọ ga-adịrị igbo nile nma, biko zite anyị ozi ka anyị soro gị kpaa nkata.

– Onye maara ede asụsụ igbo ọkachasị ndị maara ede ‘Igbo izugbe’.

– Onye nwere ike ịtụgharị asụsụ bekee n’igbo na onye nwere ike ịsụgharị asụsụ bekee na igbo.

– Ndị nwere ihe puru iche ha n’eme ikwalite asụsụ na omenala ndị igbo dịka ndị n’emeputa ihe onyonyo na nkiri ọchị n’asụsụ igbo.

– Onye n’eseta esemese na ndị nwere ndeko dị iche-iche gbasara Ala-igbo na ụmụigbo, biko nu bịa nu ka anyị hazie ọnọdu Igbo n’ụwa.

– Ọbụrụ na onwere ihe ọbụna ị chọrọ igwa anyị maka Ndi Igbo Kwenu ga enyere anyị aka nma nma melite ihe anyị n’eme ebe-a biko zitere anyị ozi.

I nwekwara ike izite anyi ozi na ndiigbokwenu@yahoo.com 

Uche unu nile dị anyị mkpa, ọbụrụgodi nwaọbere ozi ma ọ bụ nnukwu ozi ka ị zitere, anyị ga-ege gị ntị. Daalu nu rie nne

Comments

comments

About ndiigbokwenu1

Check Also

igbo-men-nollywood-actors-nwaafo-ndi-igbo-kwenu

Too Nwoke igbo ibe gị afa dị nma

Ị hụ nwanne gị n’ụzọ, kele ya ka ụmụigbo si ekele. Kele ya n’olu igbo, too ...

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *