Home / Ụwa / Ala Igbo / Ọbụghị iwu: Igbo ndị ọma nụrụ olu m.

Ọbụghị iwu: Igbo ndị ọma nụrụ olu m.

obughi-iwu-nwoke-oma-igbo-men-african-kings

Ọbụghị iwu na anyị na ndị asụsụ ọzọ ga ebi. Ọbụghị iwu na ndị asụsụ ọzọ ga anabata anyị n’Ala ha. Ọbụghị iwu na ha ga-ahụ anyị n’anya. Ọbụghị iwu na ha ga esoro anyị dozie Obodo ka ọ dị nma. Ọbụghị iwu na anyị ga edoziriri Ala ha tupu anyị edozie nke anyị. Keduzi ihe ji anyị aka? Igbo gee nu mu ntị.

Ọbụrụ na ọnwere ndị n’achọghị ka anyị na ha biri, ka anyị hapụ ha, lata beanyị rụọ ezigbo ụlọ ebe anyị ga ebi. Onye igbo abụghị osisi n’adịghị eje ije, hapụ ebe ha n’egbu gị, lata ebe bụ nke anyị.

Ọbụrụ na onwere ndị na-asị na anyị bụ ndị ajọ mmadụ, Ọbụrụ na ọnwere ndị n’achọghị ka anyị na ha rụkọọ ọrụ dozie obodo anyị na ha so nwere, ka anyị lata beanyị dozie nke sọọsọ anyị nwe.

Ọbụrụ na ọnwere ndị sị na ha ga anọ nkịtị ka ndị ogbu mmadụ gbusisie anyị na Ala ha, ka anyị hapụ ha aka lata beanyị, jiri amamihe Chukwu nyere anyị mee atụmaatụ otu anyị ga esi chebe Ala-Igbo ka Ala-Igbo bụrụ ebe anyị na ndị hụrụ anyị n’anya nwere ike ibi n’udo- jiri anya n’abụ hie ura.

Cheta nu na ìgwè bụ ike, ka anyị nnọkọọ ọnụ dozie Obodo anyị, ọbụrụ na anyị chọọzie ịga Obodo ọzọ ga neyerie anya, e nwere mba ruru 193 n’ọnụ ọgụgụ n’ụwa a. Ha ncha nwere ọtụtụ ọmalịcha ihe ga-amasị anyị. Ọnweghị ike ka ndị n’ahụghị anyị n’anya nwere ihe karia ụwa nile.

Ọnweghị onye sị na ọ agaghi ekwe ka anyi laghachi Ala igbo. Ọnweghi mgbe ụmụigbo nwere ikwugide, Ọnweghị mgbe ụmụigbo gburu mmadu tupu anyị aruọ ihe nile anyị rụgasịrị na Ala ndi ọzọ. Keduzi ihe kpatara anyị ji emefuzi ọbara kita oge idozi Ala igbo ruru?

Olileanya m bụ na n’oge n’adịghị anya, ụmụigbo agaghị ebezi akwa na ndị anyị ka nma anabataghị anyị be ha. Kama ọbụrụgodi na anyị ga ebe akwa n’oge dị n’iru, ka anyị n’ebe na ndị nwere ihe ka nke anyị nma achọghị ịnabata anyị.

Mana kedu Obodo maara ihe n’agaghị ekwe ka ha na ndị Igbo bụrụ oyi?. Igbo ndị ọma nụrụ olu m.

Comments

comments

About ndiigbokwenu1

Check Also

dozie-ala-igbo-Nigeria-Biafrans-freedom-onwe

Onye chi n’eche na echekwa onwe ya

Ụnyaahụ, ihe ọjọọ jọgburu onwe ya mere na Turkey. Ndị dị ka ndị ISIS tụrụ ...

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *