Home / Column / Kedu ka anyị si rute ebe a?

Kedu ka anyị si rute ebe a?

12524408_1754191558147582_96977449991997837_nOkwu ana-asọ anya anaghị ebi gboo…
Gịnị kpatara alụm nwayị ji buzie ije ụbịam kita?
Mmemme Ije nke mbụ (1st visit party)
Mmemme Ije nke abụọ (2nd visit part)
Mmemme Ije nke atọ (3rd visit party)
Igba nkwụ (Trditional Marriage)
Agbam akwụkwọ nke ụka (church wedding)
Agbam akwụkwọ nke ụlọ ikpe (court marriage)
Mmemme Ikele Chukwu (thanks given party)
….
Abịakwa na nke a kpọrọ ‘list,’ e dee ihe anya ga-ahụ gbaa ọbara
Ana enwezi Ihe Onyonyo (TV), Siga (Cigarette), Paint, Blocks, fridge, water dispenser, dgz… gịnị gbasara ihe ndị a na omenaala Igbo?
Ọbụghịzị; aka, Ọjị, oseọrjị, Mmanya, sọọsọ
Ego isi onye gụchagoro mahadum dịzị iche na nke onye agụchabeghị..
Hahahah…
Nwa agbọ niile na-achọzi onye ọga-abụ o gosi nne na nna ya, ha-añụrịa maka na oji nnukwu ego igwe.
Nwoke niile chọrọ ilụ nwayị, obi ana ede ya mmiri. Ọ na-achọkwu onye jitụ ego.
O mezie, onye ụmụ agbọghọ na ụmụ ikoro ana ebizi ndụ asị, mpụ na aghụghọ

Kedu ka anyị si rute ebe a?
Ọbụ otua a ka nne na nna anyị si lụọ?
Ọbụ omenaala anyị?

Ndị beanyị, asị na a tọgide nze n’akpịrị, o k kwue eziokwu. A sịkwara na ọ bụrụ na ụmụnna erighị nne, a gụrụ ọgọ gụnye. Anyị ana emekwa ihe ga eme ka anyị na ndị ọgọ anyị bụrụ bụrụ ụmụ nne? Ọkụkọ na-abọpụta mma na-egbu ya.
Ọbụ omenaala ka anyị na eme ka ọ bụ omeneelu?
……………………..……………………
Edemede a si n’aka Nwadịọramma .
Echefukwala iso Nwadịọramma na facebook ọbụrụ na ị choro ina’ahu ezigbo edemede dị ka nke a

ENUGWU STETI OFU OBI
SUNRISE FM 96.1 (ESBS)

 

Comments

comments

About ndiigbokwenu1

Check Also

Enugu-lifestyle-and-golf-city-development

Enugu Lifestyle And Golf City

Aṅụrị juru ọtụtụ ndị Enugwu Steeti obi otu ndị ọchịchị ha si emepe ngalaba nile ...

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *