Home / Ụwa / Ala Igbo / Ikperikpe Ọgụ!

Ikperikpe Ọgụ!

Ikperikpe Ọgụ!

Egwú dike na-agba. Egwú anyị ji eje agha. Egwú eji amaara ndị n’adịghị atụ ụjọ. Egwú ụmụigbo ji enye ndị nna nna anyị otito. Ikperikpe Ọgụ anyị ji dị ebube. Omenala eji maara anyị. Egwú nwa ji echeta na nna ya bụ onye mmeri. Egwú anyị gbara maka na anyị meriri ndị ọzọ.

Ọnwere ndị asụsụ ọzọ nọ n’Obodo a nwere egwú kajara-akaja ka nke anyi? Mba! Sọọsọ ụmụigbo ga-anụ na ọgụ n’abịa, kama ha ga-agbawa ọsọ, ha ebido gbawa egwu n’ihi na Mmiri agaghị elonwu azụ, Otu ọbụla ọ sọrọ ya dịrị omimi. Anyị ma na anyị ga enwe mmeri. Ndị ọzọ ma kwa ndị anyị bụ.

Anyị agaghị echefu otu e si agba Ikperikpe ọgụ n’ihi na ọ bụ ihe anyị ji dị ebube. Site n’oge Chukwu kere ụwa ruo kita, ọnweghị ndị meriri anyị, ọnweghị ndị gbuchapunwuru ndị igbo. Ọbụrụ na ha gbuchapunwuru anyị, anyị agaghị anọ ebea n’agba egwú mmeri.

Ya mere anyị ji sị ka onye echezona! omenala anyị ga adị. Ọbụrụ na ọnweghịzị onye na-agba Ikperikpe ọgụ, maara n’ụbọchị ahu na ọnwere ndị gbuchapuru ndị igbo. Mana ọgaghị eme eme. Chi anyị dị ndụ. Igbo bụ Agụ! anyị ga agbagide egwú a ruo mgbe ebighị ebi. Anyị ga na-agba Ikperikpe Ọgụ.

Kama ihe dị egwu ga eme ndị igbo, ndị igbo emee ihe dị egwu.
Ohafia Kwenu! Abiriba Kwenu! Igbo nile Kwezuo nu oooo!

Comments

comments

About ndiigbokwenu1

Check Also

Enugu-lifestyle-and-golf-city-development

Enugu Lifestyle And Golf City

Aṅụrị juru ọtụtụ ndị Enugwu Steeti obi otu ndị ọchịchị ha si emepe ngalaba nile ...