Home / Ụwa / Ala Igbo / Enyimba FC meriri Etoile du Sahel

Enyimba FC meriri Etoile du Sahel

enyimba

Enyimba FC meriri Etoile du Sahel’ si Tunisia 3 – 0 n’isọmpi  bọọlu ha gbara na Port Harcout n’ụbọchị ụka gara-aga. Ha mere nkea iji gosi mmadụ niile na ha dị njikere inweta ọnọdụ na CAF Champion League.

Onye nyere ha mmeri bụ Mfon Udoh, ya bụ onye nyere goolu atọ eji merie ndị Etoile du Sahel. Goolu atọ a kwalitere ole goolu Udoh nwere kita ruo 7 n’egwuregwu isọ mpi a.

Goolu izizi ya bịara na nkeji Itoolu mana Udoh ezurọ ike ebeahu. Na nkeji Iri-ise na isii, Udoh hụrụ ohere ọzọ inye goolu nke abụọ. Nkea mere ka Enyi Aba deruo obi ala n’ihi na mmeri dị ha nso. Ndị igbo sị ụzọ dị nma a gaa ya ugboro abụọ, onwerọ mgbe ha sị onye nwere ike iga ugboro atọ agana. Ya mere mgbe Udoh hụrụ ohere ọzọ na nkeji iri-asatọ, ọ nyere goolu nke atọ.

Enyimba na Etoile du Sahel ka ga-agbakwa ọzọ na April 19. Unu ga-echeta na Enyimba FC bụ naanị Clọbu si Naijiria fọrọ n’ime Isọmpi Afrika.

Comments

comments

About ndiigbokwenu1

Check Also

igbo-war-dance-african-warriors-dance-igbo

Ikperikpe Ọgụ!

Ikperikpe Ọgụ! Egwú dike na-agba. Egwú anyị ji eje agha. Egwú eji amaara ndị n’adịghị ...

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *