Home / Featured / E kpughego atumaatu ndị APC abụọ kpara na nzuzo imegbu ndị igbo

E kpughego atumaatu ndị APC abụọ kpara na nzuzo imegbu ndị igbo

Onwere nkiri emepụtara n’afọ gara-aga ọtụtụ ndị mmadụ n’ekegasị ugbua. Nkiria kpughere nkata ndị APC abụọ kpara na nzuzo gbasara atụmaatụ ndị ugwu na ndị ọdịda anyanwụ tụrụ gbasara ọchịchị Naijirịa.  N’ime nkiri a ha kwuru ihe ha zubere ime ndị South East na South South ọkachasị ndị igbo.

Ọnwerọ onye n’anụbeghị  akwa ndị South East na ndị South South n’ebe gbasara otu ndị ọchịchị Naijirịa si emegbu ha. Ma Onye ntị chiri anụgo akwa a. Otego aka ndị SE na SS n’asị ka nzukọ ndị nile so nwere Naijirịa tinye anya na otu e si ekewa ego n’etiti ka oke mmadụ nile n’enweta hara ofu. Maka na otu o siri dị kita, o doro mmadụ nile anya na ọnwere ala ebe ndị ọchịchị ka emefuego, ma nwee ala ebe ha wezugara-aka ka ọ tọbọrọ nkịtị. Ọbụrụ na ị che na enwe amaghị ọfịa, ị nwere echiche ọzọ ị ga eche ma ị gechaa ihea ntị.

Gee nu ntị ka unu nụrụ akụkọ ndị ndọrọ-ndọrọ ochịchị a.

Onye kirie ya gwa nwanne ya. Otua ka anyị ga ekpughe ihe ọjọọ nile zoro ezo ndị ọjọọ n’eme n’abali, ka ndị ọma maara ụzọ ha ga esi n’ehihie.

Comments

comments

About ndiigbokwenu1

Check Also

obughi-iwu-nwoke-oma-igbo-men-african-kings

Ọbụghị iwu: Igbo ndị ọma nụrụ olu m.

Ọbụghị iwu na anyị na ndị asụsụ ọzọ ga ebi. Ọbụghị iwu na ndị asụsụ ...

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *