Home / Ụwa / Ala Igbo / Abia Steeti ga-akọ osisi akwu ruru nde 7.5 tupu afọ atọ agaa.

Abia Steeti ga-akọ osisi akwu ruru nde 7.5 tupu afọ atọ agaa.

Abia-state-agricultural-development-oru-ugbo-ala-igbo

Ndị ọchịchị Abia Steeti amalitela njem ilaghachi n’ọrụ ugbo.  Ha zubere ịkọ osisi akwu ruru nde 7.5 tupu afọ atọ agaa.

Ha zubere ibanye ọrụ ugbo buru ibu.

Commissiona ọrụ ugbo na Abia Steeti, Uzo Azubike, kwuru sị na ebumnuche ha bụ ịkọ akumaku n’aga ahịa ụwa nile na-anabata.

“ N’ihi nke a Steeti a ga-ebido mepewa nnukwu ugbo na ngalaba dị iche-iche ebe a ga-akọ ukwu-osisi akwu”

“N’ime obodo ọbụla anyị ge-emepe nnukwu ugbo, ndị obodoahu ga eso bụrụ ndị nwee ugboahu. Na ọ g’enye ndị mmadụ ọrụ ma gbanyere ndị Abia ugwu ịkọpụta akumaku dị nma n’ahụ ma mmadụ rie ya.

Mazi Azubike kwurukwa sị na ha malitewo njem imeghachite usoro ebe ụlọ-akwụkwọ niile ga-enwe ugbo ụmụakwụkwọ ga n’elekota anya dịka osi adị n’oge gara-aga”

O kwukwara sị na ha ga eji osisi ọhụrụ dochie osiso ọbụla akọrọ mgbe 1960s.

Commissiona gwara ndị odeakụkọ na ha enyego ndị n’etinye ego n’ahịa ụfọdụ nnukwu ugbo Cashew dị na Abia Steeti. Ha mere nkea ka efe dịrị ha ịtụkwasị obi ha na sọọsọ ọrụ ugbo n’akpatara ha ego nne”.

Comments

comments

About ndiigbokwenu1

Check Also

Enugu-lifestyle-and-golf-city-development

Enugu Lifestyle And Golf City

Aṅụrị juru ọtụtụ ndị Enugwu Steeti obi otu ndị ọchịchị ha si emepe ngalaba nile ...

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *