Home / Ụwa / Ala Igbo / Futbọl clọbu nile dị n’ala igbo n’eme ọfụma

Futbọl clọbu nile dị n’ala igbo n’eme ọfụma

Futbọl clọbu nile dị n’ala igbo n’eme ọfụma n’ime 2015/2016 Naijirịa Premier League a n’agba ugbua.
N’ime egwuregwu izu iri na abụọ a, Enugu Rangers bụ ndị nọ n’elu club nile so na isọmpi afọa. N’ime maachi iri na abụọ ha gbagoro, ha nwere 24 points. Kemgbe 1984 Enugu rangers ebulibeghi Iko mmeri Naijirịa Premier League. Ndị n’eso ha arịọgo Gọvanọ Iheanyi Uwanyi ka ọ kwado ha ka ha nwee ike ibunata iko mmeri nke afọa.
FC Ifeanyi Ubah nọ n’onodu nke abụọ. Onye isi club a, Ifeanyi Ubah mefuru ezigbo ego n’elu clọbu ya iji hụ na ha mere ọfụma n’ime afọ a. Otu ihe si aga kita, egoahu nile o mefuru n’elu FC Ifeanyi Ubah bara uru.
Ndị nọ n’ọnọdụ nke atọ bụ Abia Warriors nke Abia Steeti. Ha ka nwere ofu match ha g’agba, mana site na maachi iri na otu ha gbagoro, ha nwee akara iri abụọ.
Rivers United FC nọ n’ọnọdụ  nke anọ. N’ime maachi iri na abụọ ha gbagoro ha nwetara akara iri na itoolu.

Enugu-rangers-enyimba-heartland-fc-Abia-warriors-FC-ifeanyi-ubah
Clọbu ndị ọzọ si ala igbo so na Isọmpi afọa bụ Heatland FC nke Imo Steeti na Enyimba Aba na Abia Steeti. ọnọdu Enyimba adịrọ nma mancha. Ha nọ n’ọnọdụ nke iri na itoolu.  Nkea pụtara na ọbụrụ na ha esighi ebeahu pụọ tupu isọmpi a agwu, ha agaghị eso zọọ iko mmeri nke afọ 2016/2017.

Mana dịka ihe si dị kita, onweghi onye ụjọ n’atụ n’Aba n’ihi na ihe kpatara Enyimba jiri nọdụ na ọnọdu iri na itoolu bụ maka n’ọọ sọọsọ maachi asaa ka ha gbagoro. Isọmpi Afrika Enyimba so agba megharịrị atụmaatụ na oge e kwesịrị ịgba maachi ise ha karị ịgbago n’oge gara-aga.
Heatland FC Owerri nọ na ngbada n’ọnọdụ iri na isi. Ọ bụrụ na ha merie maachi ha na ndị Sunshine Stars g’agba n’ụbọchị ụka ha nwere ike irigoro elu ruo ọnọdụ nke itoolu.
Unu ga-echeta na Heart FC Owerri na Enugu Rangers bụ naani clọbu n’agabeghi relegation kemgbe e bidoro Naijirịa Premier league.

Comments

comments

About ndiigbokwenu1

Check Also

obughi-iwu-nwoke-oma-igbo-men-african-kings

Ọbụghị iwu: Igbo ndị ọma nụrụ olu m.

Ọbụghị iwu na anyị na ndị asụsụ ọzọ ga ebi. Ọbụghị iwu na ndị asụsụ ...

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *